Igbo Proverbs, Idioms & Phrases

E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ

August 20, 2022 Blossom Ozurumba Season 1 Episode 4
Igbo Proverbs, Idioms & Phrases
E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ
Show Notes

Date: August 15, 2022

Podcast Title: E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ
Season 01|Episode 04
Episode title and number: IPIP S01E04

 

Summary of episode:

Igbo bụ Igbo, mma mma nụ!. N’ụbọchi nke taa n'Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka inwe obi ekele. Ọ bụ ihe ọṅụ na ndi mmadụ kwupụtara ma gosipụta ka obi dị ha nyegara ndi mmadụ ibe ya karịsịa mgbe ha nọ n’etiti anyi. Ndụ adighi adigide. Biko, kelee ma kwanyere ndị mmadụ ugwu, maka echi di ime, onweghi onye ma ihe ọ ga amụ.

Host: Mụ nwa, Blossom Ozurumba, na-anabata gị dịka oge niile. Ngwa, were ilu nke ga abara gi uru...

Igbo: E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ.

Literal Translation: Na ikọwa ya n'okwu bekee, nke a pụtara, “When the neighborhood rooster is sold in the market square, the entire neighbours will finally know that it takes some effort to wake up daily, on time.”

English Language Equivalent: Ngwa were otu ọmụmatụ odidi ya na asụsụ bekee, “You never know what you have until you lose it, and once you lose it, you would never get it back”.

Sponsor:

Cheta n’ọbụ ndi otu Igbo Wikimedians User Group wetere unu ya bụ Igbo proverbs, idioms and phrases. Biko gaa na www.wikimediaigbo.org ka ikpọtụrụ ha ma kelee ha maka nkwado ha.

Call to Action: Maka ihe ndi ọzọ gbasara usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases, biko gaa na www.igbopip.com ka imara ha n'uju. Ndewo ndi ọma pụrụ iche.